Mummy Miracle Onyibor – K’ayi Jee Kele Eze (Mp3 Download, Lyrics)

Nigerian gospel music minister, Mummy Miracle Onyibor, a born singer and songwriter, Self-styled, is out with this amazing tune titled “K’ayi Jee Kele Eze“. Listen and download below.

K’ayi Jee Kele Eze by Mummy Miracle Onyibor

K’ayi Jee Kele Eze Lyrics by Mummy Miracle Onyibor

Bianu soronu mu-o
K’ayi jee eee (Oya oo!)
Biakwanu soronu mu-o
K’ayi jee eee (Ngwa oo)
Bia soro mu ka-anyi jee kele Chukwu
Onye ana ekwu nwekwara ihe O n’eme
Onye di ndu ji ugwo I kele Chineke kere ya.
Erikwala otuto Chukwu ooo
Biakwanu soronu mu-o
K’ayi jee eee
Anyi ejeko ebee?
K’ayi jee kele Eze na O mekwala. (Hey!)

K’ayi jee kele Eze na O mekwala.
(Repeat through)

Anyi ejeko ebee? (Respond)
*Umu Ibe ayi jeko ebee?(Respond)
*Onye nwere aku were biawa (Respond)
*Onye nwere uba were biakwa (Respond)
*Obu n’Inwere ego biko were biawa (Respond)
*Onye O nyere ndu were ndu gi bia e (Respond)
*Oburu n’Odighi ihe I nwere nye ya obi gi (Respond)
*Naani otuto ka O n’eri (Respond)
*Ndi enyi m bianu soronu m (Respond)
*Umu okorobia bianu o (Respond)
*Umu agboghobia bianu o (Respond)
*Umu akwukwo biko gbakota (Respond)
*Ndi nne na nna unu abiago? ( Respond)
*Driver, I jikerewo? (Respond)
*Conductor I nokwa nso? (Respond)
*Ohaneeze ngwanu k’ayi jebenu (Respond)
*K’ayi jewe, k’ayi jewe, k’ayi jewe, k’ayi jewe, k’ayi jewe, k’ayi jewe (Respond)
*Ooooh! Anyi ejeko ebee? (Respond)
*K’ayi jeenu kele Eze na O mekwala ooo(Respond)
*Hay! (Respond)

  Ada Ehi - Now (Mp3 Download, Lyrics)

*Instrumental

Etoo dike na nke O mere O mekwa ozo
Ekele Onye gburu okuko, O gbue ewu
Okwa I ma na-ajaa Chukwu mma n’ihe O n’eme
Okwa I ma n’Ikele ya n’olu O n’aru ee
Okwa I ma n’Ijaa ya mma n’olu O n’aluru gi
Nwannem na O g’emere gi karia nke O mere eme
Enyim na O g’emere gi karia nke O mere eme
Ezi enyi erikwala otuto Chukwu e
Nwannem erikwala otuto diri Chineke
Maka n’iwe g’ewe ya ma I riwe otuto yanu
Ewerela otuto diri ya wee nyenu arusi
Ewerela otuto diri Chineke nye mmadu o
Maka na O dighi onye Ya na ya n’eke otuto ya
O bu Alpha na Omega
O bu dike na dimkpa
O bu O loro ihe loro enyi e
O bu amara ezu o
O bu Iyi erioba, Onyiri obubu
O bu Iyi erioba, Onyiri obubu
Gidigbam, gidigbam, gidigbam, gidigbam, gidigbam
Igwe, Igwe, Igwe
Odogwu n’agha ka O bu e (Hayi!)

(K’ayi jeenu kele Ya na O mekwala)
K’ayi jee kele Eze na O mekwala

Okwa O nyere gi ndu n’ime otutu afo gara-aga?
Okwa O chebere gi n’afo anyi no n’ime ya?
Okwa O n’edu gi eje naabata?
Okwa O na-anaputa umu nwanyi n’omumu nwa?
Okwa aririo I rioro ya ka O mere gi nwannem?
Gini mere n’Igaghi ekele Chineke m?
Gini mere n’Igaghi enye ya otutu ruru ya?
I g’enwe anya ukwu nwannem?
Ezi oyi I g’enwe anya ukwu kam jua?
Ezi nwannem I g’abu onye anya ukwu?
Kelebenu Chineke na O mekwala
Kelebenu Chineke na O mere ihe oma
Kelebenu Chineke na O gworo gi oria
Kelekwa Chineke na O duru gi jee wee laa
Kele Chineke na O mere I wee raru tete
Kele ya, kele ya, kele ya, kele ya, kele ya, kele ya, kele ya
Owu Onye Eze

  Steve Crown – What A Mighty God ft Nathaniel Bassey

K’ayi jee kele Eze na O mekwala
(Repeat through)

*Anam aju ayi jeko ebee? (Respond)
*Umu Ibe ayi jeko ebee? (Respond)
*Buru aku n’uba biawa o (Respond)
*Buru ihe n’ile biawa (Respond)
*Buru ji n’okuko bia (Respond)
*Ihe obula I nwere biawa (Respond)
*Oburu n’Inweghi ego were obi gi biawa (Respond)
*Ihe O choro bu ekele nke afo ofufo (Respond)
*Ihe O choro bu ekele nke afo ojuju (Respond)
Hay!

Abasi ayaya oo!
Abasi ayaya oooo!!
Dike na dimkpa, Chukwu nwike
Igbe oma n’eche ndu n’Izuru ka eme e
Ogodo mkpuchi oto mu n’olu m ekele kwa kwa
Dike na dimkpa, Chukwu Miracle Onyibor
Ana m ekele Gi o
Ana m aja Gi mma
Ana m ebuli gi elu o
Ana m enye gi ekele
Isi ala na O bu gi nwe ya n’ime ndu m n’ile.

K’ayi jee kele Eze na O mekwala (Riwe ekele mu o Papa)
K’ayi jee kele Eze na O mekwala (Chukwu oma nara ekele mu o onye oma)
K’ayi jee kele Eze na O mekwala (Eze ebube nara ekele mu o)
K’ayi jee kele Eze na O mekwala (O dogwu ooo, hay!)
K’ayi jee kele Eze na O mekwala (Odogwu, Odogwu, Odogwu)
K’ayi jee kele Eze na O mekwala

Leave a Comment